Proverbs 24

Okwu nke iri abụọ

1Ekwosola ndị ajọ omume ekworo,
ka ihe banyere ha ghara ịtọ gị ụtọ.
2Nʼihi na-atụmatụ obi ha niile bụ otu ha ga-esi mee ihe ike,
egbugbere ọnụ ha na-ekwu naanị maka ọgbaaghara.

Okwu nke iri abụọ na otu

3Ọ bụ amamihe ka e ji ewu ụlọ,
ọ bụkwa nghọta ka e ji eme ka o guzosie ike.
4Sitekwa nʼihe ọmụma ka akụ niile ji ejupụta nʼime ya,
bụ akụ ndị pụrụ iche ma dịkwa oke ọnụahịa.

Okwu nke iri abụọ na abụọ

5Onye maara ihe na-emeri site nʼịdị ike,
ndị nwere ọmụma ihe na-akpali ike ha.
6Ejela ọgụ ma ọ bụghị na i nwetara ezi ndụmọdụ,
nʼihi na nzọpụta dị nʼige ọtụtụ ndị ndụmọdụ ntị.

Okwu nke iri abụọ na atọ

7Amamihe dị elu nke ukwuu nye ndị nzuzu,
ha gaghị asaghe ọnụ ha nʼọgbakọ ọnụ ụzọ ama.

Okwu nke iri abụọ na anọ

8Onye na-eche echiche ime ihe ọjọọ
ka a ga-agụ dịka onye nzube ihe ọjọọ
9Nzube niile nke onye na-enweghị uche bụ mmehie,
ndị mmadụ na-akpọ onye na-akwa emo asị.

Okwu nke iri abụọ na ise

10Ọ bụrụ na ị pụghị iguzosi ike nʼoge nsogbu,
ị bụ nnọọ onye ike ya dị ntakịrị.
11Napụta ndị a na-eduba nʼọnwụ.
Napụtakwa ndị ahụ a mara ikpe ọnwụ nʼụzọ na-ezighị ezi.
12Ọ bụrụ na ị sị, “Anyị amaghị banyere ihe ndị a,”
ọ bụ na onye na-enyocha obi aghọtaghị ya?
Ọ bụ na onye na-eche ndụ gị amaghị ya?
Ọ bụ na ọ gaghị akwụghachi onye ọbụla ụgwọ dịka akaọrụ ya siri dị?

Okwu nke iri abụọ na isii

13Nwa m nwoke, rachaa mmanụ aṅụ nʼihi na ọ dị mma.
Mmanụ aṅụ nke si nʼugbugbo mmanụ aṅụ na-adị gị ụtọ nʼọnụ.
14Marakwa na otu a ka amamihe kwesiri isi tọọ obi gị ụtọ.
Ọ bụrụ na i chọta ya
i nwere olileanya nke ga-adịgide.

Okwu nke iri abụọ na asaa

15Adịla ka onye na-emebi iwu, onye echiche ya niile bụ imegide ụlọ onye ezi omume.
A gakwala ga kwakọrọ ihe dị nʼụlọ ya.
16Nʼihi na onye ezi omume nwere ike daa ugboro asaa ma o ga-ebilikwa ọzọ.
Ma ndị na-emebi iwu na-asọ ngọngọ mgbe nsogbu bịakwasịrị ha.

Okwu nke iri abụọ na asatọ

17Aṅụrịla ọṅụ mgbe onye iro gị dabara na nsogbu.
Ka obi gharakwa ịtọ gị ụtọ mgbe ọ dara.
18Nʼihi na Onyenwe anyị pụrụ iwe iwe nʼihi ya
megide gị ma kwụsị ịta ya ahụhụ.

Okwu nke iri abụọ na itoolu

19Ekwosola onye na-emebi iwu ekworo,
maọbụ nwe anya ukwu nʼebe onye ajọ omume nọọ.
20Nʼihi na onye na-emebi iwu enweghị ọdịnihu;
a ga-afụnyụkwa ọkụ onye ajọ omume.

Okwu nke iri atọ

21Nwa m, tụọ egwu Onyenwe anyị na onye bụ eze,
esonyerela ndị ozi na-enupu isi megide nna ha ukwu.
22Nʼihi na ọ bụ na mberede ka ị ga-eso ha daba na nhụju anya.
Onye maara ihe ga-abụ ọgwụgwụ ya?

Okwu ọzọ ndị amamihe kwuru

23Ndị a bụkwa okwu ọzọ ndị amamihe kwuru,

iji gosi na ikpe ikpe na-akwụghị ọtọ adịghị mma.
24Onye ọbụla nke na-asị onye ikpe mara, “Onye ezi omume ka ị bụ,”
Onye ọbụla nke na-asị onye na-emebi iwu, onye ikpe na-amaghị ka ị bụ

ga-anata ọbụbụ ọnụ site nʼọnụ ọtụtụ mmadụ, mba niile ga-eweso ya iwe.
25Ma ọ ga-adịrị ndị ahụ na-abara onye ikpe mara mba na mma,
ha ga-anatakwa ezi ngọzị.

26Ọsịsa ziri ezi
bụ ihe na-egosi ikwesi ntụkwasị obi.
Dịka nsusu e susuru nʼegbugbere ọnụ


27Rụchaa ọrụ gị dị nʼezi.
Dozie ala ubi gị.
Emesịa wuoro onwe gị ụlọ.

28Agbala ama ụgha megide onye agbataobi gị nʼefu.
Ọ bụ egbugbere ọnụ gị abụọ ka ị ga-eji ghọọ aghụghọ?
Maọbụ, rafuo mmadụ

29Asịla, “Aga m emeso ha dịka ha siri meso m.
Aga m akwụghachi ha ụgwọ ihe ha mere.”

30Esitere m nʼubi otu onye umengwụ gafee,
bụ ubi vaịnị nke onye na-enweghị uche,
31hụ na ogwu etochiela ya,
ahịhịa etochiekwala ya;
mgbidi dị ya gburugburu adaakwala.
32Elegharịrị m ya anya
site na ya mụta otu ihe a:
33Nwa ụra nta, nwa iru ụra nta,
nwa ịchịkọba aka nta zuo ike
34ụbịam ga-abịakwasị gị dịka onye ohi,
ụkọ abịakwasịkwa gị dịka onye na-apụnara mmadụ ihe.
Copyright information for IboBIU